Egwu Agbachaekurunwa bụ ihe eji mara ndi Ụmụcho Ụmụediabali Ihitteaforukwu Ahiazu Mbaise n'Imo steeti. A na-agba ya oge ekeresimasi, ọ bụrụ na mmadụ nwụọ, ikufute nwa, ihe nrisa, na ihe ndi ọzọ dị iche iche.
No licensed photograph yet
Four in five rooms open without one. Add a photograph with a declared licence and your credit sits under it, permanently.
Egwu Agbachaekurunwa bụ ihe eji mara ndi Ụmụcho Ụmụediabali Ihitteaforukwu Ahiazu Mbaise n'Imo steeti. A na-agba ya oge ekeresimasi, ọ bụrụ na mmadụ nwụọ, ikufute nwa, ihe nrisa, na ihe ndi ọzọ dị iche iche. Nwanyị ọbụlà mụrụ nwa n’ụlọ ọgwụ, a na-eburu egwu a ga n’ ụlọ ọgwụ, gaa kuru ya na nwa kutere di ya. Nwanyị na-alụ dị, tolue ịlụ dị, e ji egwu akpọla ya na di
Mana ana-agbakarịcha ya n' ọnwa Nọvemba rue Disemba n' oge afọ ọhuru. ụmụanyị ndị na anọghi n’obodo na-ekwo egwu a kworo otu ọ dị ụtọ n’egwu ọdịnaala abata n’obodo.
A na eji egwu a enye umunwanyi nọ na dị na-eme isi ike ọzụzụ, site na-iri ha nha. Isi ike a bụ ihe ndi di ka izuo ohi, ịkwaa iko, ịtụ asi na imegbu mmadụ. iwu ndị na ejikọlata nwanyị n' obodo. Ya cheta na aga eri ya iwu, ojikọlata onwe ya.
Na igba egwu a, a na eyi uwe elu ụmụnwanyị, na ichafu isi. 1
Ngwa egwu eji Akụ ya
Ngwa egwu eji akụ ya bụ isi ogwe, udu, ọyọ, ogele na ọkwá. 1
The text above is adapted from the Wikipedia article “Egwu Agbachaekurunwa”, available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 licence. 1
Agbachaekurunwa Dance is recorded in open cultural data. The structured record cited below does not describe the practice, and this entry has not yet been reviewed by a person familiar with the tradition. 2