Mmụtaka bụ egwu ndi obodo Ubaha nke di n' Umunze Anambra Steeti. Egwu a si n' egwu a na-akpo Mkpọkịtị wee pụta. Egwu a bụ mmụtaka bidoro n' ụlọ akwụkwọ. Mgbe ahụ, a na-agbakari ya site na elekere iri ụtụtụ ruo elekere iri na ofu.
Mmụtaka bụ egwu ndi obodo Ubaha nke di n' Umunze Anambra Steeti. Egwu a si n' egwu a na-akpo Mkpọkịtị wee pụta. Egwu a bụ mmụtaka bidoro n' ụlọ akwụkwọ. Mgbe ahụ, a na-agbakari ya site na elekere iri ụtụtụ ruo elekere iri na ofu. A na eme nke a ma ụra tụba ụmụ akwukwo, ewe si ha pụta iro. Ha putakwanụ iro ahụ, ha emegharicha áhụ wee banye kwaa wee guwazie kwa akwụkwọ, ụra apụ. Oge ana-eme ihe a ka Mkpọkịti a nke bukwa aha onye egwu a sitere n’aka ji nwe wee hụkọtachaa ụmụaka ndị mere ihe a. Ka umuaka a na eme ya mgbe o bula, ha wee buru ụmụaka siri ike wee gosikwa na o bu onye siri ike ga-agbawu egwu a. Nke a mere akpo egwu a Mkpokịti.
Site mgbe ahu, a na-agbazi egwu a. Amatara ihe gbanyere egwu a na afo 1970s. E jiri egwu Mkpokiti merie otutu ogene olaedo ugboro na ato na Naịjirịa. O bu ya ka agbara na afo 1970 mgbe emere National competition nke mbu nke ndi Arts and Culture ebe egwu a nwetere ogene olaedo nke izu. Egwu were nwetakwa ogene olaedo ozo na afo 1971 na obodo Ibadan. Otu a ka o dikwa na afo 1972 na Kaduna mgbe o bukwere ogene olaedo ahu ozo.
Otito a nukwa na obodo Umunze ruo taa. A gbagidere egwu a ruzie oge Mkpokịti onye o bidoro na aka nwụrụ. Egwu Mkpokiti wee kewazie na otu di iche iche nke Mmutaka bu otu n’ime ha.
Ihe eji kpọọ egwu a Mmụtaka bu oke a no na mkpokiti ahu udi ihe a na agba, ndi mmadu wee che na enwere ọgwụ di ya. Mana a na enwe nkowa na ihe a na-agba bu ihe amụtara amụta nke kariri ọgwụ.
E nwere otutu akwa eji aku mmutaka.
The text above is adapted from the Wikipedia article “Egwu MMỤTAKA”, available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 licence.
egwu mmụtaka is Mmụtaka is the song of the Ubaha community in Umunze, Anambra State, according to the structured record cited below. This entry was generated automatically from that record and has not yet been reviewed by a person familiar with the tradition. 1