Egwu Mmọnwụ Ọkanga bụ nke ndi Okwoamankwọ Ngwo. Ọkanga a bụ egwu ndi ukwe na-agba, agbashi ike. Sọ ụmụ nwoke bụ ihe na-agba egwú a. Eji ya eje akwamozu, ịgba nkwụ, ma ọ bụru na enwee ihe a na-eme na gọọmentị ugbua, egwu a na-eje ebe ahụ.
No licensed photograph yet
Four in five rooms open without one. Add a photograph with a declared licence and your credit sits under it, permanently.
Egwu Mmọnwụ Ọkanga bụ nke ndi Okwoamankwọ Ngwo. Ọkanga a bụ egwu ndi ukwe na-agba, agbashi ike. Sọ ụmụ nwoke bụ ihe na-agba egwú a. Eji ya eje akwamozu, ịgba nkwụ, ma ọ bụru na enwee ihe a na-eme na gọọmentị ugbua, egwu a na-eje ebe ahụ. Na obodo nwe egwu a, a na eji ya akwa ndị nọ na otu mmọnwu a ma ha nwụọ. Ndị na-agba egwú a bụ ụmụaka, ndị okenye na-agbakwa, mana mmụọnwụ pụta, mmụọnwụ a nwe egwu a pụta, ụmụaka ama agbazị egwu ahụ, ụmụnwaayi agaghị agbakwa egwu ahụ ozọkwa. O nwere usoro eji ágbá egwu Ọkanga. Ọ bụrụ na ị chọrọ ka ọgaranya bia akwamozu, ị ga ebunye ndị nka ahụ nwe Ọkanga ahụ mmanya. Ha ṅuchaa mmanya, ebuzie egwu a gawazie ebe aga emezi ya bu akwamozu. Ọbụghị onye yi ezigbo ákwà dị ọcha na agba egwu a maka aga ete unyi n'ákwà ahụ. Ọkanga bu Égwu eji ike na obi añuri agba [1]. 1
Ngwa Égwu Ọkanga
Ana enyi uwe na-acha agwa dị iche iche eberisiri eberi were agba egwú a. A na-eyi aka n'olu na ma jiri ọdụ ehi n'aka abụọ tinyere iberibe asịsa ana eyi n'ukwu na ikpere. Ndị n'aka ya egwu a n'agwa isi agụ na okpu ndị nze iji gosipụtakwa omenala 1
Ndị a bụ ụfọdụ ngwa eji akụ egwu ọkanga. 1
The text above is adapted from the Wikipedia article “Egwu Mmọnwụ Ọkanga”, available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 licence. 1
Ọkanga Masquerade Dance is recorded in open cultural data. The structured record cited below does not describe the practice, and this entry has not yet been reviewed by a person familiar with the tradition. 2