Storytelling

Igbo proverbs

Ilú bu mmánú ndi igbo ji eri okwu.ona-abu okenye kwube okwu otinyero ilu,oburu okwu nwata. Dị ka e kwuru, ọ bụrụ na ị gbara ndị okenye ọsọ n'ihi ajọ ume, ị gaghị enweta amamihe. Ilu bu otu njirimara ndi igbo. Osokwazi n'otu ejije ndi igbo.

Photo taken during the Documenting Igbo Proverbs, Riddles and Building Audio Archives Project 2026 in Enugu State
Photo taken during the Documenting Igbo Proverbs, Riddles and Building Audio Archives Project 2026 in Enugu State
Photo taken during the Documenting Igbo Proverbs, Riddles and Building Audio Archives Project 2026 in Enugu State
Photo: Nwonwu Uchechukwu P · CC BY-SA 4.0+ Add licensed photo →
Understand in 30 Seconds · In Plain Words

Quick guide to Igbo proverbs

Sourced or Silent · CC BY-SA 4.0

Ilú bu mmánú ndi igbo ji eri okwu.ona-abu okenye kwube okwu otinyero ilu,oburu okwu nwata.

01 · What it is
Storytelling

Spoken epic, verse, ballad, proverb, or narrative transmitted aloud.

02 · Where & name
Geography awaiting source

Add a cited source naming the region or community that carries it.

03 · How it is doing
□□□□ (Not yet assessed)

Documented in open cultural records, but no cited field assessment of its current vitality has been added here yet.

04 · Proof & reuse
2 cited sources

Every claim links to a public record below. Free to quote, teach, and share under CC BY-SA 4.0.

Chapter Takeaways
Ibi-kọ ọnụ na n'udoÉgbé belu ugo belu,nke si ibe ya ebena,nku kwaa ya E ree oké ọkpa nọ n'ógbè, agbataobi amara na itete ụra bu ọrụ.
Ilu banyere akụ na ụba na ịda ogbenyeOnye na achikota ji di ka aku n'uba kwesiri iweputa oge je leta ndi be’nne ya nihi na obughi ji ka oga agbakwuru oso ma o’rue mgbe nsogbu ga a’bia.
Ilu banyere ọrụAdịghị ebute ozu ọdụm n'ụlọ.
Ọkwu amamihe maka ọnwụỌnwụ na ihụ ọgụ na-esi na chi.
Common Questions Answered on Record
What is Igbo proverbs in plain words?

Ilú bu mmánú ndi igbo ji eri okwu.ona-abu okenye kwube okwu otinyero ilu,oburu okwu nwata.

Where is Igbo proverbs practised or documented?

No verified geographic place has been linked on record yet — editors can add a cited place from the edit page.

What is the current condition of Igbo proverbs today?

□□□□ (Not yet assessed): Documented in open cultural records, but no cited field assessment of its current vitality has been added here yet.

How do I cite or share this Igbo proverbs entry?

Cite as: "Igbo proverbs." folkroom, https://folkroom.org/art-forms/igbo-proverbs, text CC BY-SA, with attribution.

Share or cite this roomNo tracking · CC BY-SA 4.0
WhatsAppXLinkedInRedditFacebook

The tradition & historical record

7 min read · 2 sources

Ilú bu mmánú ndi igbo ji eri okwu.ona-abu okenye kwube okwu otinyero ilu,oburu okwu nwata. Dị ka e kwuru, ọ bụrụ na ị gbara ndị okenye ọsọ n'ihi ajọ ume, ị gaghị enweta amamihe. Ilu bu otu njirimara ndi igbo. Osokwazi n'otu ejije ndi igbo. Ya mere na onye igbo obula kwesiri ima otu esi eji ha na mkparita uka na ighota ihe niile di na ndu maka na agwọ emeghị ihe o ji bụrụ agwọ, ụmụaka ewere ya kee nkụ. Ilu ndi igbo na akpali amamihe si'te na ịmetụ akụkụ dị iche iche nke ndụ aka. 1

Ibi-kọ ọnụ na n'udo

Égbé belu ugo belu,nke si ibe ya ebena,nku kwaa ya E ree oké ọkpa nọ n'ógbè, agbataobi amara na itete ụra bu ọrụ. Onye yi uwe agbazitere agbazi anaghị agba si egwu ike. Ikwu amaghị ibe ezi ya. Akidi si na ọ maghị ebe ókè ala ahụ dị. Di na nwunye rijuo afọ malite ịlụ ọgụ, ndi bụ ọnụ aka ha mma. Ọ nweghị onye Chukwu n'agọzighị, sọ onye ahụ si na nke ya ezughị okè. Emenyere nwaogwugwu, emenye kwara nwọnọsike. Ọ bụrụ na nwanyị na-akwanyere ndị mmadụ ùgwù, di ya anaghị ajụ iri nri ya. ọkụkọ kwuru na ọ naghị eti mkpu ka ihe ahụ jide ya tọhapụ ya, kama ọ bụ ka ndị mmadụ na uwa níle nụ’ru olu ya. Ebe amuru nmadu ka ana ama maka ya Mgbe mbe zutara akwa ọfụrụ, ọ na-aga nzukọ iji dozie esemokwu, n'agbanyeghị na onweghị onye kpọrọ ya. Nwata bulie nna ya enu, ákwà mkpuchi nna ya ga ekpuchi anya nwata ahụ. Onye ji mmadu n’ala ji kwa onwe ya. Mgbe onye nwe ụlọ malitere ịgosi onye ọbịa ji fọdụrụ n'ite, mara n'oge una erugo. Kelee onye nti chiri, oburu n’eluigwe anughi, uwa nuru. Onye maara ihe n’Aba bu onye nzuzu n’Abba. Ewu nke onye ogbenye bụ ehi ya. "Nwunye anyị, nwunye anyị", mgbe abalị ga-abịa, anyị ga-ama onye ọ bụ nwanyị ya n'ezie. Ọgọ biakaria, ezie ya n'kpata nkụ. Onye di nkirika jee akwamozu, a sị ya nyere ndi na-egbu anụ aka. Nwata hụkarịa enyi nne ya, o gbuo ya mmaekwu. Ndụ mmiri, ndụ azụ, mmiri atala, azụ anwụla. Ụtọ bụ elecha aghara. Mgbe otu onye isi di mma kpọrọ ndi ara itenanị gafee, ihe anyi mara bụ na ndi ara iri gafere. Udele na égbè anaghị azọ nri; udele na-eri ozu; égbè na-ebu na n'ike. Onye nwere mmadụ ka onye nwere ego. 1

Ilu banyere akụ na ụba na ịda ogbenye

Onye na achikota ji di ka aku n'uba kwesiri iweputa oge je leta ndi be’nne ya nihi na obughi ji ka oga agbakwuru oso ma o’rue mgbe nsogbu ga a’bia. Ọ bụrụ na mmadụ achịkọta akụ na ụba n’erighị ihe, ọ hụbeghị ka o si dị onye nwụrụ anwụ?ọ bụrụ na okwu abaa na ego, onye dara ogbenye na agbachi nkịtị. Aki oyibo si na onye bara ọgaranya na-eri nri obere obere. Nwa ọkụkọ si na si'te na ịtụ nri obere ebe a na ebe ozo ka oji eri ju afọ. Ewu nwuru n'oba ji abughi agu gburu ya. Enweghi ego na'eme ede adi ụtọ dị ka ji. Onye nwere ihe ọriri ọbụla na-ekwu na ede na agbakasi ya ahụ na akpasụ ya iwe. Nwa ogbenye anaghi aza omeokachie. Onye ọ dịrị mma kwaa nna, ọ bụghị diọkpara gburu ya. Ọkụkọ na-akpa nri n'obi onye ohi nọ ite ofe nso. Akụ bụ iro, nwata kpata akụ, ọ kpata iro. 1

Ilu banyere ọrụ

Adịghị ebute ozu ọdụm n'ụlọ. Aka aja aja na ebute ọnụ mmanụ mmanụ. Ahịa ukwu amaghị na otu onye abiaghị. A rụọ na anwụ, erie na ndo. Ụwa dịka ara nne ehi, ọ gaghị agba mmiri ma ọ bụrụ na ịpighị ya aka ọfuma. Ube mere ihe ézè ji rachaa ntụ. Onye kwe, Chi ya ekwe. Agbaka m mbọ bụ ego nri, ụba si na Chi. Nwata kpata kalịa ibe ya na nkụ, a sị n'ọkpalụ n'ajọ ọhịa. Mgbe onye ji tete ụra bụ ụtụtụ ya. Azụ rahụ ụra, azụ ibe ya elo ya. Ahịa onye na-azụ ka ọ ma anya ya. Diji kwụrụ ọtọ gwubie ji ọdụ, ọ ma nọdụ ala bọpụta ya. Agaghị eji mgbagbu ghara ọgụ. Ihe na esere mkpi na onye kpụ ya bụ; gasie ike. Ihe agụ ji eme ire di ya na mbọ aka. "Nkem abụghị nsogbu", ka uzú na-ekwu mgbe ọbụla, ya kpatara na ọ nweghị mma agha. Ejighị ụtụtụ ama njọ ahịa. Ọ bụrụ na ihe nile diri egbe mma n'elu, ọ gaghị agbadata n'ala izu uriọm. Ọ bụ naanị ụkwụ gbara apịtị na-eri ihe gụrụ ya. Udele sịrị, na nwa nwunye ya mụrụ dị ndụ, ya enwee nwa; Ọ nwụọ anwụ ọ, ya enwe nri abalị. Emesia, emesia bụ ọnwụ na-egbu onye ume'ngwụ. Ọ na-abụ azọta ala tupu azọwa ute. Aki ga-agba mmanụ aghaghị igabiga n'ọkụ. Otu onyeara ka asị bịa kere oké ihe nna ya nwụrụ anwụ, ọ sị na nke o ji ka. Nwa okuko uriọm hapụ nne ya kpawa nri, egbe eburu ya. Ọkụkọ na-akwa ákwá nwere mgbe ọ bụ àkwá. Ọ bụ naanị nwata na-eti aki ewegara okenye ka ọ na-azọtara nkume. Mgbada sịrị onye chọrọ igbu ya buru ụzọ metee ya n'ụra, ma ya bụrụzia na ya ejighị ọsọ zọpụta onwe ya. Mbe si na olụ ọha di mma, mana oriri ọha na-agwu ike. E were otu ọkụkọ chụọrọ arụsi abụọ àjà, ha egbuo mmadụ mezuo ya. Oké nkịta sịrị na ọ bụ anya ka ya ji eri àjà a chụrụ n'elu. Mgbe nnukwu anụ ji apụta n'ọhịa bụ mgbe dinta sọrọ ngọngọ ọrụ. Ụtụtụ bụ ahịa mana ehihie bụzi maka ekwurekwu. 1

Ọkwu amamihe maka ọnwụ

Ọnwụ na ihụ ọgụ na-esi na chi. E gbuo maka iwe, e nie maka isi isi. Ọ buru na ọnwụ egbughị nwata akwụkwọ, ọ ga-abụ onye nkụzi. Ụwa bụ ahịa onye zụchaa, ọ naa. Ozu kwe ka ọ hà, e'lie ya n'oge. Ọ bụ mmụọ ndi na-efe na-egbu ha. A tụọ onye iro ndụ, ọ zụta ọnwụ. Onye gburu nwanne ya abụghị Odogwu. Ekweghị ekwe na-ekwe n'ute ekwere. Ọnwụ egbughị ji e jiri chụọ àjà, e mesie o pue ome. Ọnwụ amaghị eze; ọ na egbu onye ukwu, ọ na egbu onye nta. Osisi ahụ gburu mmadụ dị elu karịa onye ahụ. Atụrụ sịrị na ọ na-aka mma a mụọ nwa ka a tụrụkwa ime ọzọ, n'ihi na ọnwụ di na-abịa na mberede. Onye na-emegbu nwa mmadụ, ọ ga-edu nke ya were laa mmụọ. 1

Nkpachapu anya/ọkwu ndụmọdụ

Ihe ehi hụrụ gbalaba ọsọ ka ọkụkụ hụrụ na-atụ ọnụ. Osimmiri anaghi eri onye ọ hụghị ukwu ya. Ka enetachaa,ka enetachaa melu mgbó ji atu enwe n'isi. Ọ bụghị egwu ọ bụla ka ana-agba chiri ụtaba na aka. Awó anaghi agba oso ehihie na efu. Nwata n'agba sụrụgede, marakwa na sụrụgede bu egwu ndi mmụọ. A na-eji anya a'mara ọka cha ra acha. Nwata akwo n'azu amaghi na ije di úfú. Nwam anwula,nwam anwula..nwam ichoo inwu inwuo abo adighi n'ulo odi n'ohia. Mgbe enyí tinyere ụkwụ ya n’ala, onye ọ bụla na-ahụ ụzọ ụkwụ ya. Enwere ahihia di iche iche n’ime ohia, mana ndi mmadu na abanye ohia na acho akwukwo okazi. Nwa ọkụkọ kwuru na ọ na - ele anya n’elu mgbe ọ na a nnu mmiri n’ihi na ihe na egbu ya sitere n’elu abia. Ọ bụrụ na nwatakịrị na amabeghi ihe jụ wa ese ihe mere nna ya, ihe mere nna ya na-eme ya. Ọkụkọ nti ike na-anụ ihe na ite ofe. Ọ bụrụ na e nye isi ndụmọdụ ma ọ naghị anụ nti, mgbe ebichapuru isi, nti ga esoro ya banyere n’akpa. Ụkpana okpoko gburu, ntị chiri ya. Ugo rie awọ, mma ya arụọ. Nwayọ ka eji egbu anwụnta bèlù na akpa amụ. Nkwụ́cha abụghị ụjọ. 1

The text above is adapted from the Wikipedia article “Ilu igbo”, available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 licence. 1

Igbo proverbs is storytelling and to guide behavior. Each proverb communicates a principle about life, community or human behavior in a simple but powerful way, according to the structured record cited below. This entry was generated automatically from that record and has not yet been reviewed by a person familiar with the tradition. 2

No recording linked yet — know one? Point at it →
Sources on Record
[1]Wikipedia: Ilu igbo · encyclopedia
Sourced or Silent · Still Open

Questions awaiting a cited source

+ Answer with a source →
How many people perform it today?
When is it first attested, and by whom?

Other rooms in Storytelling

Same family · with a photograph